5. Umu Israel we si na Rameses bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Sukot.
6. Ha si na Sukot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Itam, nke di n'usọ ọzara.
7. Ha si n'Itam bulie ije, jeghachi rue Pai-hahairot, nke di n'iru Beal-zefon: ha ma ulo-ikwū-ha n'iru Migdol.
8. Ha si n'iru Hahairot bulie ije, gabiga n'etiti oké osimiri ba n'ọzara: ha je ije nke ubọchi atọ n'ọzara Itam, ma ulo-ikwū-ha nime Mara.
9. Ha si na Mara bulie ije, biarue Ilim: isi-iyi miri iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di kwa n'Ilìm; ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu.
10. Ha si n'Ilim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie.
11. Ha si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sin.
12. Ha si n'ọzara Sin bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Dọfka.
13. Ha si na Dọfka bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Alush.
14. Ha si n'Alush bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Refidim, ebe ndi Israel nēnweghi miri iṅu.
15. Ha si na Refidim bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ọzara Sainai.
16. Ha si n'ọzara Sainai bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na Kibrot-hataava.