51. Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we nara ha ọla-edo ahu, bú ihe nile akpuru akpu.
52. Ọla-edo nile nke àjà-nbuli ahu nke ha buliri Jehova we di orú nnù shekel uzọ abua, na nnù, na ọgu iri na asa, na iri, bú nke sitere n'aka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na n'aka ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise.
53. (N'ihi na ndikom nke usu-ndi-agha ahu lutara ihe n'agha, nwoke ọ bula ọ lutara n'onwe-ya.)