Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 31:36-46 Bible Nso (IGBOB)

36. Nkera ahu, nke bu òkè nke ndi nāpu ba n'usu-ndi-agha, we di n'ọnu-ọgugu ìgwè ewu na aturu orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise:

37. útù atùru Jehova, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, we di nnù na ọgu iri-na-atọ, na iri na ise.

38. Ehi di kwa orú nnù uzọ anọ na nnù iri; utu aturu Jehova site na ha we di ọgu atọ na iri na abua.

39. Inyinya-ibu di kwa orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise; utu-ha aturu Jehova we di ọgu atọ na otù.

40. Madu di kwa orú nnù uzọ abua; utu aturu Jehova site na ha we di orú madu na iri na abua.

41. Moses we nye Eleeza, bú onye-nchu-àjà, utu ahu, nke bu àjà-nbuli Jehova, dika Jehova nyere Moses iwu.

42. Moses we nara na nkera nke umu Israel, nke Moses kerara site na ihe ndikom nēbu agha,

43. (ma nkera nke nzukọ Israel, nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, di orú nnù ọgu uzọ abua na uzọ abua, na nnù atọ, na ọgu iri-na-ise,

44. ìgwè ehi di orú nnù uzọ anọ, na nnù iri,

45. inyinya-ibu di orú nnù uzọ atọ, na nnù iri-na-isi, na ọgu ise,

46. madu di orú nnù uzọ abua;)

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 31