Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 30:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Moses we gwa ndi-isi nke ebo nile nke umu Israel okwu, si, Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu.

2. Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n'ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme.

3. Nwayi kwa, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, were kwa isọ-nsọ ke onwe-ya ab͕u, n'ulo nna-ya, mb͕e ọ di na nwata;

4. nna-ya we nu nkwa-ya, na isọ-nsọ-ya o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ma nna-ya b͕ara ya nkiti: nkwa-ya nile gēguzosi kwa ike, isọ-nsọ ọ bula nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u gēguzosi kwa ike.

5. Ma ọ buru na nna-ya si ya, É-è, n'ubọchi ọ nuru ya; ọ dighi ihe ọ bula nime nkwa-ya nile, ma-ọbu nime isọ-nsọ-ya nile nke o ji ke nkpuru-obi-ya ab͕u, gēguzosi ike: Jehova gab͕aghara kwa ya, n'ihi na nna-ya si ya, É-è.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 30