Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 3:35-38 Bible Nso (IGBOB)

35. Onye-isi ulo nna nke ab͕uru abua Merari nwere bu Zuriel nwa Abihail: ha nāma ulo-ikwū-ha n'isi ebe-obibi ahu chere iru n'Ugwu.

36. Nlekọta nke ihe-ndebe nke umu Merari bu ibo nile nke ebe-obibi ahu, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na akwa ya nile, na ihe-ya nile, na òfùfè-ya nile:

37. na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.

38. Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'iru ebe obibi ahu chere iru n'Iru-anyanwu, n'iru ulo-ikwū nzute chere iru n'ọwuwa-anyanwu, bu Moses, na Eron na umu-ya ndikom, nēdebe ihe-ndebe nke ebe nsọ ahu, bú ihe-ndebe nke umu Israel; onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 3