Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 27:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. N'ìhi gini ka agāgupu aha nna-ayi n'etiti ab͕uru-ya, n'ihi na o nweghi nwa-nwoke? Nye ayi ihe-onwunwe n'etiti umu-nne-nna-ayi ndikom.

5. Moses we weta ikpé-ha nso n'iru Jehova.

6. Jehova we gwa Moses okwu, si,

7. Ọ bu ihe ziri ezi ka umu-ndinyom Zelọfehad nēkwu: i ghaghi inye ha ihe-onwunwe nke ihe-nketa n'etiti umu-nne nna-ha ndikom; i gēme kwa ka ihe-nketa nna-ha gabiga rue ha aka.

8. Ọ bu kwa umu Israel ka i gāgwa okwu, si, Mb͕e nwoke gānwu, ma o nweghi nwa-nwoke, unu gēme kwa ka ihe-nketa-ya gabiga rue nwa-ya nwayi aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 27