Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 27:16-22 Bible Nso (IGBOB)

16. Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,

17. onye ganāpu apu n'iru ha, onye ganābà kwa abà n'iru ha, onye ganēme kwa ka ha nāpu apu, onye ganēme kwa ka ha nābà abà; ka nzukọ Jehova we ghara idi ka ìgwè ewu na aturu nke nēnweghi onye-ọzùzù.

18. Jehova we si Moses, Kuru n'onwe-gi Joshua nwa Nun, bú nwoke nke Mọm di nime ya, bikwasi ya aka-gi;

19. guzo kwa ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọm nile; nye ya iwu n'anya-ha.

20. I gātukwasi kwa ya ufọdu nime ebube-gi, ka nzukọ nile nke umu Israel we nu.

21. Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.

22. Moses we me dika Jehova nyere ya iwu: o we kuru Joshua, guzo ya n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na n'iru nzukọ Israel nile:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 27