Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 26:59-65 Bible Nso (IGBOB)

59. Aha nwunye Amram bu Jokebed, nwa Livai, nke amuru ya nye Livai n'Ijipt: nwayi ahu we muara Amram Eron na Moses, na Miriam, bú nwa-nne-ha nwayi.

60. Amu-kwa-ra nye Eron Nebad na Abaihu na Eleeza na Itama.

61. Nedab na Abaihu we nwua mb͕e ha wetara nso n'iru Jehova ọku ala ọzọ.

62. Ndi-ha agukọtara agukọta di orú nnù uzọ abua, na nnù iri-na-asa, na ọgu iri nwoke ọ bula site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru: n'ihi na agukọtaghi ha n'etiti umu Israel, n'ihi na enyeghi ha ihe-nketa n'etiti umu Israel.

63. Ndia bu ndi Moses na Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.

64. Ma n'etiti ndia ọ dighi nwoke ọ bula di sitere na ndi Moses na Eron, bú onye-nchu-àjà, gukọtara; ndi gukọtara umu Israel n'ọzara Sainai.

65. N'ihi na Jehova kwuru okwu bayere ha, si, Ha aghaghi inwu n'ọzara nka. Ọ dighi kwa nwoke ọ bula fọduru nime ha, ma-ọbughi nání Keleb nwa Jefune na Joshua nwa Nun.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 26