Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 23:2-14 Bible Nso (IGBOB)

2. Belak we me dika Belam kwuru; Belak na Belam we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

3. Belam we si Belak, Guzo onwe-gi n'akuku àjà-nsure-ọku-gi, ma ka m'je; eleghi anya Jehova gābia izutem: ma ihe ọ bula Ọ gēme ka m'hu m'gēgosi kwa gi ya. Ọ we je ugwu nke ọhia nādighi.

4. Chineke we zute Belam: ọ we si Ya, Ebe-ichu-àjà asa ahu ka m'doworo n'usoro, m'we sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-aja ọ bula.

5. Jehova we tiye okwu n'ọnu Belam, si, Jeghachikuru Belak, ọ bu kwa otú a ka i gēkwu.

6. Ọ we jeghachikuru ya, ma, le, ọ nēguzo n'akuku àjà-nsure-ọku-ya, ya onwe-ya na ndi-isi Moab nile.

7. O we tua ilu-ya, si,N'Eram ka Belak nēsi dutem,Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si,Bia, buaram Jekob ọnu,Bia kwa, wesa Israel iwe.

8. Gini, m'gākọcha? Chineke akọchaghi.Gini kwa m'gēwe iwe? Jehova eweghi iwe.

9. N'ihi na n'elu oké nkume ndia ka m'si ahú ya,Ọ bu kwa n'ugwu ntà ndia ka m'si ekiri ya:Le, otù ndi ka ọ bu, ọ nēbi iche,Ọ dighi-agu onwe-ya n'etiti mba nile.

10. Ònye gutaworo ájá Jekob,Na ọnu-ọgugu nke otù uzọ n'uzọ anọ nke Israel?Ka mu onwem nwua, ọnwu nke ndi ziri ezi,Ka ikpe-azum di kwa ka nke ya!

11. Belak we si Belam, Gini ka i meworom? ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kutere gi, ma, le, i gọziwo ha nke-uku.

12. Ọ we za, si, Ihe Jehova nētiye n'ọnum, ọ̀ bughi nka ka m'gēlezi anya ikwu?

13. Belak we si ya, Biko, sorom je n'ebe ọzọ, ebe i gēsi hu ha; nání nsọtu-ha ka i gāhu, ma i gaghi-ahu ha nile: gi kọcha-kwa-ram ha site n'ebe ahu.

14. Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 23