15. Na nkpọrube nke ndagwurugwu ahu,Bú nke nēwezuga onwe-ya n'uzọ ebe-obibi A,Nke nādabere kwa n'ókè-ala Moab.
16. Ha si n'ebe ahu jerue Bia: nke ahu bu olùlù-miri ahu nke Jehova gwara Moses okwu bayere ya, si, Chikọta ndim, M'gēnye kwa ha miri.
17. Mb͕e ahu Israel nābù abù a, si:Rigo, gi olùlù-miri; zanu ya:
18. Olùlù-miri, ndi-isi gwuru ya,Ndi amara aha-ha nke ndi Israel doziri ya,Ha ji nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru, ji kwa nkpa-n'aka nile ha, me ya.Ha si n'ọzara ahu jerue Matana:
19. si na Matana jerue Nahaliel: si na Nahaliel jerue Bamot:
20. si na Bamot jerue ndagwurugwu ahu nke di n'ọhia Moab, rue elu Pisga, nke nēle anya n'ebe ala ahu nke tọb͕ọrọ n'efu di.
21. Israel we ziga ndi-ozi jekuru Saihon, bú eze ndi-Amorait, si,
22. Ka m'gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi ba n'ọhia, ma-ọbu n'ubi-vine, ayi agaghi-aṅu miri olùlù-miri: n'uzọ eze ka ayi ganēje, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè- ala-gi.
23. Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha.
24. Israel we were ọnu mma-agha tib͕ue ya, we nweta ala-ya site n'Anon rue Jekob, rue umu Amon: n'ihi na ókè-ala umu Amon siri ike.
25. Israel we were obodo ndia nile: Israel we biri n'obodo nile nke ndi-Amorait, nime Heshbon, na nime umu-obodo-ya nile.