Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 21:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye Kenean, bú eze Arad, onye bi na Negeb, we nu na Israel abiawo n'uzọ Atarim; ọ we buso Israel agha, dọta ufọdu nime ha n'agha.

2. Israel we kwere Jehova nkwa, si, Ọ buru na I nye ndi nka n'akam n'ezie, m'gēwezuga kwa obodo-ha nile ka ebibie ha.

3. Jehova we ge nti n'olu Israel, nye ndi Kenean n'aka-ha; ha we wezuga ha na obodo nile ha ka ebibie ha: ewe kpọ aha ebe ahu Họma.

4. Ha we si n'ugwu Hoa bulie ije ga n'uzọ Oké Osimiri Uhie, iga ala Edom buruburu: ma nkpuru-obi ndi Israel enweghi ntachi-obi n'uzọ ahu.

5. Ndi Israel we kwue okwu megide Chineke, megide kwa Moses, si, N'ìhi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigota inwu n'ọzara nka? n'ihi na achicha adighi, miri adighi kwa; ike agwusiwo kwa nkpuru-obi-ayi n'achicha nka di nfé.

6. Jehova we zite agwọ ahu nke yiri ọku n'etiti ndi Israel, ha we ta ndi Israel aru; ndi riri nne nwupuru n'Israel.

7. Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel.

8. Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya.

9. Moses we me agwọ ọla, tukwasi ya n'ọkọlọtọ ahu: o rue, ma ọ buru na agwọ atawo madu, na ọ di ndu, mb͕e ọ legidere agwọ ọla ahu anya.

10. Umu Israel we bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Obot.

11. Ha si n'Obot bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'Iye-abarim, n'ọzara ahu nke di n'iru Moab, n'uzọ ọwuwa-anyanwu.

12. Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Zered.

13. Ha si n'ebe ahu bulie ije, ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon, nke di n'ọzara, nke si n'ókè-ala ndi-Amorait aputa: n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab, n'etiti Moab na ndi-Amorait.

14. N'ihi ya ka anāsi n'akwukwọ agha di iche iche nke Jehova,Vaheb nime Sufa,Na ndagwurugwu nile nke Anon,

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 21