Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 20:4-18 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo nkpọkọta Jehova ka ọ ba n'ọzara nka, inwu n'ebe ahu, ayi onwe-ayi na anu-ulo-ayi?

5. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu meworo ka ayi si n'Ijipt rigoputa, ime ayi ka ayi bata n'ebe ọjọ a? ọ bughi ebe nke nkpuru-ọghigha, ma-ọbu nke osisi fig, ma-ọbu nke osisi vine, ma-ọbu nke osisi pomegranate; ọ dighi kwa miri iṅu.

6. Moses na Eron we si n'iru nkpọkọta ahu biarute ọnu-uzọ ulo-Ikwū nzute, da kpue-iru-ha n'ala: ewe me ka ha hu ebube Jehova anya.

7. Jehova we gwa Moses okwu, si,

8. Were nkpa-n'aka ahu, kpọkọta kwa nzukọ Israel, gi onwe-gi, na Eron, bú nwa-nne-gi, unu gwa nkume ahu di elu okwu n'anya-ha, ka ọ we nye miri-ya; i gēme kwa ka miri si na nkume ahu di elu putara ha: i gēme kwa ka nzukọ ahu na anu-ulo-ha ṅua miri.

9. Moses we si n'iru Jehova were nkpa-n'aka ahu, dika O nyere ya iwu.

10. Moses na Eron we kpọkọta nkpọkọta Israel rue iru nkume ahu di elu, ọ si ha, Biko, nurunu, ndi nenupu isi, àyi gēme ka miri si na nkume a di elu putara unu?

11. Moses we welie aka-ya were nkpa-n'aka-ya tie nkume ahu di elu ub͕ò abua: miri riri nne we puta, nzukọ ahu we ṅua, ha na anu-ulo nile ha.

12. Jehova we si Moses na Eron, N'ihi na unu ekweghi na Mu, idom nsọ n'anya umu Israel, n'ihi ya unu agaghi-eme ka nkpọkọta nka ba n'ala ahu nke M'nyeworo ha.

13. Ndia bu miri Meriba; n'ihi na umu Israel soro Jehova se okwu, ewe do Ya nsọ nime ha.

14. Moses we si na Kedesh zigara eze Edom ndi-ozi, si, Otú a ka Israel, bú nwa-nne-gi, siri, Gi onwe-gi amawo ike-ọgwugwu nile nke gwuworo ayi:

15. na nna-ayi-hà ridara n'Ijipt, ayi we biri n'Ijipt ọtutu ubọchi; ndi Ijipt we mejo ayi, mejọ kwa nna-ayi-hà:

16. ayi we tikue Jehova, O we nu olu-ayi, zite mọ-ozi, me ka ayi si n'Ijipt puta: ma, le ayi onwe-ayi nọ na Kedesh, bú obodo nke di na nsọtu ókè-ala-gi:

17. biko, ka ayi gabiga nime ala-gi: ayi agaghi-agabiga nime ọhia ma-ọbu nime ubi-vine, ayi agaghi-aṅu kwa miri olùlù: n'uzọ eze ka ayi ganēje, ayi agaghi-ewezuga onwe-ayi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, rue mb͕e ayi gāgabiga ókè-ala-gi.

18. Edom we si ya, I gaghi-agabiga nimem, ka m'we ghara iwere mma-agha puta izute gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 20