24. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Efraim di orú nnù uzọ iri-na-atọ, na nnù iri, na ọgu ise, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. Ha gābu nke-atọ n'ibuli ije.
25. Ọkọlọtọ nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di n'akuku Ugwu, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di; onye-isi umu Dan nwere bu Ahieza nwa Amishadai.
26. Usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na ise.
27. Ndi nāma ulo-ikwū-ha n'akuku-ya bu ebo Asha: onye-isi umu Asha nwere bu Pagiel nwa Ọkran:
28. usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise:
29. ebo Naftali kwa: onye-isi umu Naftali nwere bu Ahira nwa Inan:
30. usu-ndi-agha-ya, na ndi-ha agukọtara agukọta, di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.
31. Ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū Dan di orú nnù uzọ iri-na-iteghete, na nnù iri-na-anọ. Ha gābu ndi ikpe azu n'ibuli ije, dika ọkọlọtọ nile ha si di.
32. Ndia bu ndi agukọtara agukọta nke umu Israel, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di: ndi nile agukọtara agukọta nke ọmuma-ulo-ikwū nile, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.
33. Ma agukọtaghi ndi Livai n'etiti umu Israel; dika Jehova nyere Moses iwu
34. Umu Israel we me otú a; dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mara ulo-ikwū-ha dika ọkọlọtọ nile ha si di, ọ bu kwa otú a ka ha buliri ije, nwoke ọ bula dika ab͕uru nile ya si di, n'ulo nna-ya-hà