Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 16:37-49 Bible Nso (IGBOB)

37. Gwa Eleeza nwa Eron, bú onye-nchu-àjà, ka o si n'etiti nsure-ọku ahu chilie ihe-igu-ọku ahu, gi kposa kwa ọku ahu n'akuku ahu; n'ihi na ha di nsọ;

38. bú ihe-igu-ọku nke ndi-nmehie ndia ndi megidere nkpuru-obi-ha, ka ewere kwa ha kpu mbadamba ihe ibu ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà: n'ihi na ha wetara ha nso n'iru Jehova, ha di kwa nsọ: ha gābu-kwa-ra umu Isael ihe-iriba-ama.

39. Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we chiri ihe-igu-ọku ọla ahu, nke ndi ahu esurere ọku wetara nso, ha we tisa ha ka ha buru ihe-nmachita diri ebe-ichu-àjà:

40. iburu umu Israel ihe-ncheta, ka nwoke ala ọzọ onye nēsiteghi na nkpuru Eron, we ghara ibia nso isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Jehova; ka ọ ghara idi ka Kora, di kwa ka nzukọ-ya: dika Jehova gwara ya okwu n'aka Moses.

41. Ma nzukọ nile nke umu Israel tamuru ntamu n'echi-ya megide Moses megide kwa Eron, si, Unu onwe-unu emewo ka ndi nke Jehova nwua.

42. O rue, mb͕e akpọkọtara nzukọ ahu megide Moses megide kwa Eron, na ha chere iru n'ulo-ikwū nzute: ma, le, igwe-oji ahu kpuchiri ya, ewe hu ebube Jehova.

43. Moses na Eron we bia n'iru ulo-ikwū nzute.

44. Jehova we gwa Moses okwu, si,

45. Sinu n'etiti nzukọ a bilie, ka M'we me ka ha gwusia dika n'otù ntabi-anya. Ha we da kpue iru-ha n'ala.

46. Moses we si Eron, Were ihe-igu-ọku-gi, tiye ọku n.elu-ya sitere n'elu ebe-ichu-àjà, tukwasi kwa ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, būru ya jekuru nzukọ Israel ngwa ngwa, kpuchiere ha nmehie-ha; n'ihi na iwe ahu esiwo n.iru Jehova puta; ihe-otiti ahu amalitewo.

47. Eron we were dika Moses kwuru, b͕abà n'etiti nkpọkọta ahu; ma, le, ihe-otiti ahu amalitewo n'etiti ndi Israel: ọ we tiye ihe-nsure-ọku ahu nēsì ísì utọ, we kpuchiere ndi ahu nmehie-ha.

48. Ọ we guzo n'etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.

49. Ma ndi nwuru anwu n'ihe-otiti ahu di orú nnù na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise, nāgughi ndi nwuru anwu n'okwu Kora.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 16