Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ọnu-Ọgugu 15:10-23 Bible Nso (IGBOB)

10. Manya-vine ka i gēweta kwa nso iji chu àjà-ihe-ọṅuṅu, nkera hin, ka ọ buru àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

11. Otú a ka agēmere otù oke-ehi, ma-ọbu otù ebulu, ma-ọbu otù nwa nime aturu ma-ọbu nime ewu.

12. Dika ọnu-ọgugu ihe nke unu nēdozi si di, otú a ka unu gēmere ihe ọ bula dika ọnu-ọgugu-ha si di.

13. Onye ọ bula amuru n'ala gēme ihe ndia otú a, n'iweta nso àjà-ọku nke ihe ísì utọ isurere Jehova.

14. ọzọ mb͕e ọbìa nọ n'ala-unu dika ọbìa, ma-ọbu onye ọ bula nọ n'etiti unu rue ọb͕ọ nile unu, mb͕e ọ gēme àjà-ọku nke ihe ísì utọ anēsurere Jehova; dika unu si eme, otú a ka ọ gēme.

15. Nime nkpọkọta nka, otù ukpuru diri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa, bú ukpuru ebighi-ebi rue ọb͕ọ nile unu: dika unu si di, otú a ka ọbìa ahu gādi n'iru Jehova.

16. Otù iwu na otù ikpé gādiri unu, di-kwa-ra ọbìa nke nọ dika ọbìa n'ala-unu.

17. Jehova we gwa Moses okwu, si,

18. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e unu gābà n'ala ahu ebe Mu onwem nēme ka unu ba,

19. ọ gēru kwa, mgbe unu nēri nime nri ala ahu, na unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli.

20. Ob͕e achicha nke utu ọka mbu unu ka unu gēbuli, ka ọ buru àjà-nbuli: dika àjà-nbuli nke ebe-nzọcha-ọka, otú a ka unu gēbuli ya.

21. Site n'utu ọka mbu unu unu gēnye Jehova àjà-nbuli rue ọb͕ọ nile unu.

22. Ọzọ, mb͕e unu gēme ihe n'amaghi-ama, ghara kwa ime ihe ndia nile enyere n'iwu, nke Jehova gwaworo Moses,

23. bú ihe nile nke Jehova nyere unu n'iwu n'aka Moses, site n'ubọchi nke Jehova nyere iwu, we gaba n'iru rue ọb͕ọ nile unu;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ọnu-Ọgugu 15