Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Obadaia 1:13-21 Bible Nso (IGBOB)

13. Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.

14. Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu.

15. N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'isi mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi; nmeso-gi gālaghachi n'isi-gi.

16. N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi.

17. Ma n'ugwu Zaion ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, ọ gādi kwa nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa ihe-nnweta nile ha.

18. Ulo Jekob gābu kwa ọku, ulo Josef gāghọ kwa ire-ọku, ma ulo Isọ gāghọ ahihia-ọka, ha gēre kwa ọku n'etiti ha, ripia ha: ọ dighi kwa onye fọduru afọdu ulo Isọ gēnwe; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu.

19. Ndi Negeb gēnweta kwa ugwu Isọ; ndi ebe di ala ala gēnweta ndi Filistia: ha gēnweta kwa ọhia Efraim, na ọhia Sameria: Benjamin gēnweta kwa Gilead.

20. Usu-ndi-agha nka nke umu Israel emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú nke nọ n'etiti ndi Kenean rue Zarefat, na ndi Jerusalem emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi nọ na Sefarad, ha gēnweta kwa obodo nile nke Negeb.

21. Ndi-nzọputa gārigota kwa n'ugwu Zaion ikpe ugwu Isọ ikpe; ọ bu kwa Jehova gēnwe ala-eze ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Obadaia 1