Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Obadaia 1:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Abàla n'ọnu-uzọ-ama ndim n'ubọchi nhuju-anya-ha; gi onwe-gi elekwasi-kwa-la ihe ọjọ ha anya n'ubọchi nhuju-anya-ha, unu atukwasi-kwa-la aka n'àkù-ha n'ubọchi nhuju-anya-ha.

14. Eguzo-kwa-la n'abu-uzọ, ibipu ndi-ya b͕apuru ab͕apu; emechibido-kwa-la ndi-ya fọduru nye n'aka ndi-iro-ha n'ubọchi ahuhu.

15. N'ihi na ubọchi Jehova di nso n'isi mba nile: dika i meworo, otú a ka agēme gi; nmeso-gi gālaghachi n'isi-gi.

16. N'ihi na dika unu ṅuworo ihe n'ugwu nsọm, otú a ka mba nile gāṅu ihe mb͕e dum, e, ha gāṅu, loda kwa, we di ka ha akādighi.

17. Ma n'ugwu Zaion ka ufọdu ndi b͕apuru ab͕apu gādi, ọ gādi kwa nsọ; ulo Jekob gēnweta kwa ihe-nnweta nile ha.

18. Ulo Jekob gābu kwa ọku, ulo Josef gāghọ kwa ire-ọku, ma ulo Isọ gāghọ ahihia-ọka, ha gēre kwa ọku n'etiti ha, ripia ha: ọ dighi kwa onye fọduru afọdu ulo Isọ gēnwe; n'ihi na Jehova ekwuwo okwu.

19. Ndi Negeb gēnweta kwa ugwu Isọ; ndi ebe di ala ala gēnweta ndi Filistia: ha gēnweta kwa ọhia Efraim, na ọhia Sameria: Benjamin gēnweta kwa Gilead.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Obadaia 1