N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.