Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehum 2:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.

2. N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.

3. Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n'ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.

4. N'èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n'amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n'ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.

5. Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.

6. Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.

7. Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehum 2