Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 2:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. M'we biakute ndi nāchi ala n'ofè osimiri, m'we nye ha akwukwọ-ozi eze. Ma eze zìri ndi-isi usu-ndi-agha na ndi-inyinya isom je.

10. Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, we nu ya, o we di ha njọ nke-uku na madu abiawo ichọrọ umu Israel ọdi-nma.

11. M'we bata Jerusalem, nọ n'ebe ahu ubọchi atọ.

12. M'we bilie n'abali, mu onwem na ndikom ole-na-ole sorom; ma egosighm madu ọ bula ihe Chinekem nētiye n'obim imere Jerusalem: ọ dighi kwa anu-ulo di n'ebe m'nọ, ọ bu nání anu-ulo ahu nke m'nānọkwasi ya.

13. M'we si n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu pua n'abali, we rue n'iru isi-iyi dragon, ru kwa ọnu-uzọ-ama ebe ikpofu ahihia, we le mb͕idi Jerusalem nile anya, bú nke etipúsiri etipú, ọku eripiawo kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile.

14. M'we gabiga rue ọnu-uzọ-ama isi-iyi, ru kwa ọdọ-miri eze: ọ dighi kwa ebe anu-ulo nke di n'okpurum gāgabiga.

15. M'we nārigo na miri-iyi n'abali, m'we nēle mb͕idi ahu anya; m'we chigharia, ba n'ọnu-uzọ-ama ndagwurugwu, we laghachi.

16. Ma ndi nọchiri anya eze amaghi ebe m'jere, ma-ọbu ihe mu onwem nēme; egosighkwam ndi-Ju rue ub͕u a, egosighkwam ndi-nchu-àjà, egosighkwam ndi amara aha-ha, egosighkwam ndi nọchiri anya eze, egosighkwam ndi fọduru ndi nēje ozi ahu.

17. M'we si ha, Unu onwe-unu nāhu ọnọdu ọjọ nke ayi onwe-ayi nọ nime ya, na Jerusalem bu nkpọnkpọ ebe, na esure-kwa-ra ọnu-uzọ-ama-ya nile n'ọku: bianu ka ayi wue mb͕idi Jerusalem, ka ayi we ghara ibu kwa ihe-ita-uta ọzọ.

18. M'we gosi ha aka Chineke nke di nma n'arum; na okwu nile nke eze kwa nke ọ gwaram. Ha we si, Ka ayi bilie lua mb͕idi. Ha we me ka aka-ha di ike ime ezi ihe a.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 2