Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Nehemaia 10:29-35 Bible Nso (IGBOB)

29. ha nēkekọta onwe-ha n'aru umu-nne-ha, bú ndi-ha di ebube, ha nābà kwa n'ọb͕ub͕a-iyi na n'ọṅuṅu-iyi, ijeghari n'iwu Chineke, nke enyere site n'aka Moses, bú orù Chineke, na idebe na ime ihe nile Jehova, bú Onye-nwe-ayi, nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile na ukpuru-Ya nile;

30. ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:

31. ọzọ, ndi di iche iche nke ala ahu ndi nēwebata ihe-ahia na ọka ọ bula n'ubọchi-izu-ike ire ere, na ayi agaghi-azuru n'aka-ha n'ubọchi-izu-ike, ma-ọbu n'ubọchi nsọ: ọzọ, na ayi gārapu arọ nke-asa na ihe-nbinye ọ bula.

32. Ayi me-kwa-ra ihe enyere n'iwu ka ha guzoro ayi, bú ibokwasi onwe-ayi otù uzọ n'uzọ atọ nke otù shekel n'arọ iji fè òfùfè ulo Chineke-ayi;

33. bayere achicha anēdebe n'usoro, na onyinye-inata-iru-ọma anēnye mb͕e nile, baye-kwa-ra àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e nile, nke ubọchi-izu-ike nile, na nke ọnwa ọhu nile, bayere mb͕e nile akara àkà, baye-kwa-ra ihe nsọ nile, baye-kwa-ra àjà-nmehie nile ikpuchiri Israel nmehie, bú ije-ozi nile nke ulo Chineke-ayi.

34. Ayi fe-kwa-ra nzà, bú ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ayi nile, bayere onyinye iji biaru nso, bú nkú, iwebata ya n'ulo Chineke-ayi, dika ulo nna-ayi-hà si di, na mb͕e ezubere, kwa-arọ, isure n'elu ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, dika edeworo ya n'iwu:

35. na iwebata nkupuru mbu nke ala-ubi-ayi, na nkpuru mbu nke nkpuru nile nke osisi nile, kwa-arọ, n'ulo Jehova:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Nehemaia 10