Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 6:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. Umu Israel we me ihe ọjọ n'anya Jehova: Jehova we nye ha n'aka Midian arọ asa.

2. Aka Midian we di ike n'aru Israel: n'ihi Midian ka umu Israel mere onwe-ha ebe miri nērù nke di n'ugwu, na ọb͕à, na ebe ewusiri ike.

3. O rue, ọ buru na Israel agha nkpuru, na ndi Midian rigoro ya, na ndi Amalek, na umu Iru-anyanwu; ha we rigo imegide ha;

4. ha we ma ulo-ikwū-ha imegide ha, we bibie ihe-omume ala, rue ebe i gābà na Geza, ha arapughi kwa ihe nēdebe ndu n'Israel, ma ọ bu aturu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu.

5. N'ihi na ha na anu-ulo-ha na ulo-ikwū nile ha rigoro, ha batara dika ojuju igurube n'iba-uba; ọnu-ọgugu adighi kwa ha, ọ dighi kwa camel-ha: ha we bata n'ala ibibi ya.

6. Ewe me ka Israel ghara inwe ike ma ọli n'ihi Midian; umu Israel we tikue Jehova.

7. O rue, mb͕e umu Israel tikuru Jehova n'ihi Midian,

8. na Jehova ziri otù nwoke, bú onye-amuma, jekuru umu Israel: ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem mere ka unu si n'Ijipt rigota, eme-kwa-ram ka unu si n'ulo ndi-orù puta:

9. M'we naputa unu n'aka ndi Ijipt, na n'aka ndi nile nēmeb͕u unu, M'we chupu ha n'iru unu, nye unu ala-ha:

10. M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.

11. Mọ-ozi nke Jehova we bia, nọdu n'okpuru osisi terebinth ahu nke di n'Ọfra, nke Joash, bú onye Abieza, nwere: ma Gideon nwa-ya nēticha ọka wheat n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine, iwepu ya n'iru Midian.

12. Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya, si ya, Jehova nọyere gi, gi dike bu dìnkpà.

13. Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian.

14. Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i?

15. Ọ si Ya, Biko, Onye-nwe-ayi, #M'gēji gini zọputa Israel? le, usu nnù ndikom abua na ọgu iri nkem bu nke nēnweghi ike nime Manase, mu onwem bu kwa onye pekasiri npe n'ulo nnam.

16. Jehova we si ya, N'ihi na Mu na gi gānọ, i gētib͕u kwa Midian dika otù nwoke.

17. Ọ si ya, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Gi me-kwa-ram ihe-iriba-ama na Gi onwe-gi nākpayerem uka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 6