Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 5:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,

2. N'ihi na ndi-ndú nēdu edu n'Israel,N'ihi na ndi Israel were afọ-ofufo nye onwe-ha,Gọzienu Jehova.

3. Nurunu, ndi-eze; ṅanu nti, ndi-isi;Mu onwem gābùku Jehova abù, ọbuná mu onwem;M'gābùku Jehova, bú Chineke nke Israel, abù ọma.

4. Jehova, mb͕e I siri na Sia puta,Mb͕e I siri n'ọhia Edom zọ ije,Ala mara jijiji, elu-igwe bu-kwa-ra miri,Igwe-oji nile nke b͕ara ọchichiri bu-kwa-ra miri.

5. Ugwu nile rudara dika miri n'iru Jehova,Ọbuná Sainai ahu n'iru Jehova, bú Chineke nke Israel.

6. N'ubọchi Shamga nwa Anat,N'ubọchi Jael, okporo-uzọ nile ghara idi,Ndi nēje ije n'uzọ we je n'okporo-uzọ b͕agọrọ ab͕agọ.

7. Obodo ntà we ghara idi n'Israel, ha we ghara idi,Rue mb͕e mu, bú Debora, biliri,Rue mb͕e mu, bú nne n'Israel, biliri.

8. Ha rọputara chi ọhu di iche iche;Mb͕e ahu agha di n'ọnu-uzọ-ama nile:Àhuru ọta ma-ọbu ubeN'etiti orú nnù madu uzọ ise n'Israel?

9. Obim di n'ebe ndi-ònyé-ukpuru nke Israel nọ,Ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha n'etiti ndi Israel:Gọzienu Jehova.

10. Unu ndi inyinya-ibu ọcha nēbu,Ndi nānọkwasi n'uwe-nwuda,Unu na ndi nēje ije n'uzọ,Tugharinu uche.

11. N'ebe dipuru anya n'olu ndi-uta, n'etiti ebe isere miri,N'ebe aku ka ha gākọ akukọ ezi omume nile nke Jehova,Bú ezi omume nile O mere obodo ntà Ya n'Israel.Mb͕e ahu ndi Jehova ridara rue ọnu-uzọ-ama nile.

12. Teta, teta, Debora;Teta, teta, kwue okwu abù:Bilie, Berak, dọta usu ndi i dọtara n'agha n'agha, gi nwa Abinoam.

13. Mb͕e ahu ndi fọduru nime ndi di ike nke-uku, bú ndi Israel, ridara;Jehova ridara n'ihim imegide ndi-dike.

14. Ndi nkpọrọgwu-ha di nime Amalek siri n'Efraim rida;Nēso gi n'azu, Benjamin, n'etiti umu-nna-gi.Ndi-ònyé-ukpuru siri na Makia rida,Ndi ji nka-n'aka ode-akwukwọ ese ihe si-kwa-ra na Zebulun rida.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 5