Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 4:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Debora we si, Aghaghm isoro gi je: nání na ọjija-gi agaghi-adi n'ije nke gi onwe-gi nēje; n'ihi na ọ bu n'aka nwayi ka Jehova gērenye Sisera. Debora we bilie, soro Berak jerue Kedesh.

10. Berak we kpọkọta Zebulun na Naftali rue Kedesh; o we were ukwu-ya rigo, ya na orú nnù ndikom na nnù ise: Debora we soro ya rigo.

11. Ma Heba, bú onye-Kenait, siri na Ken kewapu onwe-ya, bú site n'umu Hobab nwa-nne nwunye Moses, we ma ulo-ikwū-ya rue osisi terebinth nime Zaananim, nke di n'akuku Kedesh.

12. Ha we gosi Sisera na Berak nwa Abinoam arigowo n'ugwu Teboa.

13. Sisera we kpọkọta ub͕ọ-ala-ya nile, bú nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise, na ndi nile ndi soro ya, site na Haroshet nke mba di iche iche ọzọ, rue miri-iyi Kaishon.

14. Debora we si Berak, Bilie; n'ihi na nka bu ubọchi nke Jehova nyeworo Sisera n'aka-gi: Jehova, Ọ̀ pughi we je n'iru gi? Berak we si n'ugwu Teboa rida, ya na orú nnù ndikom na nnù ise ndi soro ya n'azu.

15. Jehova we were ọnu mma-agha chusa Sisera, na ub͕ọ-ala-ya nile, na ọmuma-ulo-ikwū-ya nile, n'iru Berak; Sisera we si n'ub͕ọ-ala-ya rida, b͕alaga n'ukwu-ya.

16. Ma Berak churu ub͕ọ-ala-ya nile n'azu, na n'azu ọmuma-ulo-ikwū-ya, rue Haroshet nke mba di iche iche ọzọ: ọmuma-ulo-ikwū nile nke Sisera we da n'ọnu mma-agha; ọ dighi otù nwoke fọduru.

17. Ma Sisera b͕alagara n'ukwu-ya rue ulo-ikwū Jael, bú nwunye Heba onye-Kenait: n'ihi na udo di n'etiti Jebin, bú eze Hezoa, na ulo Heba, bú onye-Kenait.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 4