14. Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.
15. Umu Israel we tikue Jehova, Jehova we me ka onye-nzọputa biliere ha, bú Ihud nwa Gira, onye Benjamin, onye nēme aka-ekpe: umu Israel we si n'aka-ya zigara Eglon eze Moab onyinye-inata-iru-ọma.
16. Ihud we mere onwe-ya mma-agha nke nwere ọnu abua, ogologo-ya bu otù cubit; o ke ya n'okpuru uwe-nwuda-ya n'apata-ukwu aka-nri ya.
17. Ọ weta onyinye-inata-iru-ọma ahu nso Eglon eze Moab: ma Eglon bu nwoke mara abuba nke-uku.
18. O rue, mb͕e o wetasiri onyinye-inata-iru-ọma ahu nso, na o zilagara ndi nēbu onyinye-inata-iru-ọma ahu.
19. Ma ya onwe-ya si n'arusi apiri api ndi di na Gilgal laghachi, si, Okwu nzuzo ka m'nwere igwa gi, eze. Ọ si, Nọdunu du. Ndi nile ndi nēguzo ya buruburu we si n'ebe ọ nọ pua.
20. Ihud we biakute ya; ma ya onwe-ya nānọdu nání ya n'ime-ulo-elu ọjuju-oyi nke o nwere. Ihud we si, Okwu Chineke ka m'nwere igwa gi. O we si n'oche-eze-ya bilie.
21. Ihud we setipu aka-ekpe-ya, si n'apata-ukwu aka-nri ya were mma-agha ahu, ma ya n'afọ-ya:
22. isi-mma we soro kwa iru-mma ba; abuba we b͕ochipu iru-mma, na ọ dọputaghi mma-agha ahu n'afọ-ya; o we pua n'otule-ya.