Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 20:12-20 Bible Nso (IGBOB)

12. Ebo Israel nile we zisa ndikom n'ebo Benjamin, si, Gini bu ihe ọjọ a nke emeworo ka ọ di n'etiti unu?

13. Ma ub͕u a nyenu ayi ndikom ahu, bú ndi jọb͕uru onwe-ha, ndi nọ na Gibea, ka ayi we me ka ha nwua, ka ayi kpochapu kwa ihe ọjọ n'Israel. Ma umu Benjamin ekweghi ige nti olu umu-nne-ha, bú umu Israel.

14. Umu Benjamin we si n'obodo nile ha chikọta onwe-ha rue Gibea, ipu ibuso umu Israel agha.

15. Umu Benjamin we gukọta onwe-ha n'ubọchi ahu site n'obodo nile ha, orú nnù uzọ atọ na nnù ise, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi ndi bi na Gibea, ndi gukọtara onwe-ha, nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa.

16. N'etiti ndi nka nile nnù ndikom na ọgu iri-na-ise ndi arọputara arọputa di, ndi nēme aka-ekpe; onye ọ bula nime ha nāmata otù agiri-isi nkume, ghara imahie.

17. Ma ndikom Israel gukọtara onwe-ha, orú ọgu uzọ abua na orú nnù uzọ iri, bú ndikom nāmiputa mma-agha, nāgughi Benjamin: ndia nile bu ndikom agha.

18. Umu Israel we bilie, rigorue Bet-el, jua Chineke ase; ha we si, Ònye gēbu uzọ rigoro ayi ibuso umu Benjamin agha? Jehova we si, Juda gēbu uzọ.

19. Umu Israel we bilie n'ututu, ma ulo-ikwū-ha megide Gibea.

20. Ndikom Israel we pua ibuso Benjamin agha; ndikom Israel we do agha n'usoro megide ha na Gibea.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 20