1. Onye-ozi Jehova we si na Gilgal rigorue Bokim. Ọ we si, Emerem unu ka unu si n'Ijipt rigota, M'we me ka unu bata n'ala nke M'ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha; M'we si, M'gaghi-emebi ọb͕ub͕a-ndum rue mb͕e ebighi-ebi, bú nke Mu ńa unu b͕ara;
2. ma unu onwe-unu na ndi bi n'ala nka ab͕ala ndu; unu gākwatu ebe-ichu-aja nile ha: ma unu egeghi nti olum: gini bu nka unu meworo?
3. M'we si kwa, M'gaghi-achupu ha n'iru unu; kama ha gāburu unu ogwu n'akuku-aru-unu, chi nile ha gābu-kwa-ra unu ọnyà.
4. O rue, mb͕e onye-ozi Jehova gwasiri umu Israel nile okwu ndia, na ndi Israel weliri olu-ha, kwa ákwá.
5. Ha we kpọ aha ebe ahu Bokim: ha we chuara Jehova àjà n'ebe ahu.
6. Joshua we zilaga ndi Israel, umu Israel we la, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya, inweta ala ahu.
7. Ndi Israel we fè Jehova òfùfè ubọchi nile nke Joshua, na ubọchi nile nke ndi-okenye ndi emere ka ubọchi-ha di anya ka Joshua nwusiri, ndi huru omume uku nile nke Jehova, nke O mere Israel.
8. Joshua nwa Nun, bú orù Jehova, we nwua, mb͕e ọ b͕ara ọgu arọ ise na iri.
9. Ha we lìe ya n'ókè-ala nke ihe-nketa-ya nime Timnat-heres, n'ugwu Efraim, n'akuku Ugwu nke ugwu Gaash.
10. Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.