Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 19:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. O welie anya-ya abua, hu onye-ije ahu n'amá obodo; agadi nwoke ahu we si, Òle ebe i nēje? òle ebe i si bia kwa?

18. Ọ si ya, Ayi onwe-ayi nēsi na Bet-lehem-juda gabiga rue akuku azu ugwu Efraim; ebe ahu ka m'si bia, m'we je Bet-lehem-juda: ọ bu kwa ulo Chineke ka mu onwem nēje; ma ọ dighi nwoke nāchikọtam na ndim n'ulo-ya.

19. Otú ọ di, ma okporo-ọka ma nri-anu-ulo diri inyinya-ibu-ayi; ọzọ kwa, achicha na manya-vine dirim, di-kwara-ra orù-gi nwayi, di-kwara nwa-okorọbia nke nēso ndi-orù-gi: ọ dighi ihe ọ bula nākọ ayi.

20. Agadi nwoke ahu we si, Udo diri gi; nání, ihe nile nākọ gi dikwasim; nání, anọla ọnọdu-abali n'amá.

21. O we me ka ọ ba n'ulo-ya, gwara inyinya-ibu nri-ha: ha we sa ukwu-ha, rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

22. Mb͕e ha onwe-ha nēme ka obi-ha di nma, le, ndikom obodo ahu, bú ndikom jọb͕uru onwe-ha, b͕ara ulo ahu buruburu, nētisi aka ike n'ọnu-uzọ; ha we gwa onye-nwe ulo ahu okwu, bú agadi nwoke ahu, si, Me ka ọ puta, bú nwoke nke bara n'ulo-gi, ka ayi we mara ya.

23. Nwoke ahu, bú onye-nwe ulo, we pukuru ha, si ha, É-è, umu-nnem, biko, unu emela ihe ọjọ; ebe nwoke a bataworo n'ulom, unu emela ihe-nzuzu a.

24. Le, nwam nwayi, bú nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, na iko-ya nwayi; biko, ka m'me ka ha puta, weda-kwa-nu ha n'ala, me ha ihe di nma n'anya-unu: ma unu emela nwoke a ihe-nzuzu a.

25. Ma ndikom ahu ekweghi ige nti ya: nwoke ahu we jide iko-ya nwayi, me ka ọ putara ha n'èzí; ha we mara aru-ya, sob͕ugide ya abali ahu nile rue ututu: ha we zilaga ya na chi-ọbubọ.

26. Nwayi ahu we bia n'isi-ututu, da n'ọnu-uzọ ulo nwoke ahu ebe onye-nwe-ya nọ, rue mb͕e ìhè putara.

27. Onye-nwe-ya we bilie n'ututu, meghe ọnu-uzọ ulo ahu, we pua ije ije-ya: ma, le, nwayi ahu, bú iko-ya, adawo n'ọnu-uzọ ulo ahu, aka-ya abua di kwa na nbata-uzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 19