Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 17:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu.

8. Nwoke ahu we si n'obodo ahu, bú Bet-lehem-juda, je ije inọ dika ọbìa ebe ọ gāchọta ọnọdu: o we ba n'ugwu Efraim rue ulo Maika ime ihe o ji bili ije-ya.

9. Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m'bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m'gāchọta ọnọdu.

10. Maika we si ya, Biri n'ulom, ghọ-kwa-ram nna na onye-nchu-àjà, mu onwem gēnye kwa gi ego ọla-ọcha iri kwa-arọ, na nke-ekike uwe, na ihe i gēji di ndu. Onye Livai we ba nime.

11. Onye Livai we kwere ibiri n'ulo nwoke; nwa-okorọbia ahu we di ya ka otù nime umu-ya ndikom.

12. Maika we mejue aka onye Livai ahu, nwa-okorọbia ahu we ghọrọ ya onye-nchu-àjà, nọ n'ulo Maika.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 17