Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 17:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Ọ we nyeghachi nne-ya ọla-ọcha ahu, nne-ya we chiri ọgu ego ọla-ọcha iri, nye onye-nnucha-ọla, o we me ya arusi apiri api na arusi awuru awu: o we di n'ulo Maika.

5. Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

6. Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: onye ọ bula nēme ihe ziri ezi n'anya-ya.

7. Otù nwa-okorọbia di kwa nke sitere na Bet-lehem-juda, site n'ab͕uru Juda, onye ahu bu onye Livai, ya onwe-ya nānọ kwa dika ọbìa n'ebe ahu.

8. Nwoke ahu we si n'obodo ahu, bú Bet-lehem-juda, je ije inọ dika ọbìa ebe ọ gāchọta ọnọdu: o we ba n'ugwu Efraim rue ulo Maika ime ihe o ji bili ije-ya.

9. Maika we si ya, Òle ebe i si bia? O we si ya, Onye Livai ka m'bu site na Bet-lehem-juda, mu onwem nēje kwa inọ dika ọbia ebe m'gāchọta ọnọdu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 17