Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 16:4-18 Bible Nso (IGBOB)

4. O rue, mb͕e nka gasiri, na ọ huru otù nwayi n'anya na ndagwurugwu Sorek, onye aha-ya bu Delaila.

5. Ndi-isi ndi Filistia we rigokuru ya, si ya, Rà ya ọnu, hu ihe ọ bu, bú nke ike uku ya di nime ya, na ihe ayi gēji pu imegide ya, ka ayi we ke ya ab͕u iweda ya n'ala: ayi onwe-ayi gēnye kwa gi, nwoke ọ bula nime ayi, nnù ọla-ọcha abua na ọgu iri-na-ise.

6. Delaila we si Samson, Biko, gosim ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya, na ihe agēji ke gi ab͕u iweda gi n'ala.

7. Samson we si ya, Ọ buru na ha ewere akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ kem ab͕u, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di.

8. Ndi-isi Filistia we chigoro Delaila akwara ọhu asa nke anāmikọghi amikọ, o we were ha ke ya ab͕u.

9. Ma o nwere ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we dọbìe akwara asa ahu, dika anādọbì eriri-nzuzu mb͕e aṅara ya ọku. Amaghi kwa ike-ya.

10. Delaila we si Samson, Le, i kwawom emò, gwam okwu-ugha: biko, gosim ub͕u a ihe agēji ke gi ab͕u.

11. Ọ si ya, Ọ buru na ha achiri udọ̀ ọhu, nke akējighi je ozi ọ bula, kesim ab͕u ike, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu ọ bula si di.

12. Delaila we chiri udọ̀ ọhu, were ha ke ya ab͕u, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. Ma ndi nēche anwu nānọdu n'ime-ulo. O we dọbìpu ha n'ogwe - aka - ya abua dika ogho.

13. Delaila we si Samson, Rue ub͕u a i kwawom emò, gwam okwu-ugha: gosim ihe agēji ke gi ab͕u. Ọ si ya, Ọ buru na i kpà osusu asa nke isim n'ákwà akpara.

14. O we were ǹtú ya, si ya, Ndi Filistia nādakwasi gi, Samson. O we teta n'ura-ya, were ǹtú nke ihe eji akpà ákwà na ákwà ahu akpara, bulie ije-ya.

15. Delaila we si ya, Ì si aṅa si, Ahurum i n'anya, ma obi-gi adighi n'ebe m'nọ? ub͕ò atọ a ka i kwaworom emò, ma i gosighm ihe ọ bu, bú nke ike uku gi di nime ya.

16. O rue, mb͕e o were okwu-ya nile kpagide ya ubọchi nile, sob͕u kwa ya, na nkpuru-obi-ya enweghi ntachi-obi rue ọnwu.

17. O we gosi ya obi-ya nile, si ya, Ọ dighi mb͕e aguba gara n'elu isim; n'ihi na onye-Nazirait nke Chineke ka m'bu site n'afọ nnem: ọ buru na akọpum isi, ikem gēsi n'arum wezuga onwe-ya, m'gābu kwa onye nādighi ike, di kwa ka madu nile si di.

18. Delaila we hu na o gosiri ya obi-ya nile, o we ziga kpọ ndi-isi ndi Filistia, si, Rigotanu otù ub͕ò a, n'ihi na o gosiwom obi-ya nile. Ndi-isi ndi Filistia we rigokute ya, chigota ego ahu n'aka-ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 16