Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Ndi-Ikpe 16:25-31 Bible Nso (IGBOB)

25. O rue, mb͕e obi-ha di nma, na ha siri, Kpọnu Samson, ka ọ we mere ayi ihe-ọchì. Ha we si n'ulo ndi ekere ab͕u kpọputa Samson; o we me ihe-ọchì n'iru ha: ha we me ka o guzo n'etiti ogidi.

26. Samson we si nwa-okoro onye nēji ya n'aka, Ka m'nọduru onwem, ka m'we metu ogidi nke ulo nēguzosi ike n'elu ha aka, ka m'we dabere ha.

27. Ma ulo ahu juputara na ndikom na ndinyom; n'ebe ahu ka ndi-isi nile nke ndi Filistia nọ kwa; ihe ra ka nnù ndikom na ndinyom asa na ọgu iri nọ kwa n'elu ulo, ndi nēle ka Samson nēme ihe-ọchì.

28. Samson we kpọkue Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, chetam, biko, Chineke, mekwam ka m'di ike nání otù ub͕ò a, ka m'bọ-kwa-ra onwem ọ́bọ̀ otù mb͕e n'aru ndi Filistia n'ihi anyam abua.

29. Samson we b͕akua ogidi abua nke di n'etiti, nke ulo nēguzosi ike n'elu ha, o we dabere ha, otù n'aka-nri-ya, na otù n'aka-ekpe-ya.

30. Samson we si, Ka mu onwem soro ndi Filistia nwua. O we were ike rulata onwe-ya; ulo ahu we dakwasi ndi-isi ahu, dakwasi kwa ndi nile nọ nime ya. Ndi nwuru anwu ndi o mere ka ha nwua n'ọnwu-ya we di ọtutu kari ndi o mere ka ha nwua na ndu-ya.

31. Umu-nne-ya na ulo nna-ya nile we rida, bulie ya, bugota ya, lìe ya n'etiti Zọra na Eshtaol n'ílì Manoa, bú nna-ya. O we kpe Israel ikpe orú arọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Ndi-Ikpe 16