1. Ndikom Efraim we kpọkọta onwe-ha, gabiga akuku Ugwu; ha we si Jefta, Gini mere i gabigara ibuso umu Amon agha, ma ayi ka i nākpọghi isoro gi je? ayi gēsure ulo-gi n'isi gi n'ọku.
2. Jefta we si ha, Onye nēse okwu nke-uku ka m'buworo, mu onwem na ndim na umu Amon; m'we tikue unu, ma unu azọputaghm n'aka-ha.
3. M'we hu na unu abughi ndi nāzọputam, m'we tiye ndum n'ọbu-akam, gabiga imegide umu Amon, Jehova we nye ha n'akam: n'ìhi gini kwa ka unu rigokuteworom ta ibusom agha?