Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Maika 2:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ahuhu diri ndi nēchèputa ajọ ihe, nālu kwa ihe ọjọ n'elu ihe-ndina-ha! n'ìhè nke ututu ka ha nēme ya, n'ihi na ọ di n'ike aka-ha.

2. Ha we tukwasi anya-uku n'ubi, nara ha n'ike; ha tukwasi anya-uku n'ulo, būru ha: ha emeb͕uwo kwa ma nwoke ma ulo-ya, bú onye ọ bula na ala-nketa-ya.

3. N'ihi nka ka Jehova siri otú a: Le, M'nēchè èchìchè ihe ọjọ megide ab͕uru nka, bú ihe ọjọ nke unu nāgaghi-ekopu olu-unu, unu agaghi-ejeghari kwa n'idi-elu; n'ihi na mb͕e ọjọ ka ọ bu.

4. N'ubọchi ahu ka agātu ilu megide unu, gosie ákwá ike, si: Apunarisiwo ayi ihe: òkè ndim ka Ọ nāb͕anwe: le ka O si ewepurum ya nke-uku! ọ bu onye nke nādaghachi azu ka Ọ nēkère ubi nile ayi.

5. N'ihi nka i gaghi-enwe onye nātu eriri-ọtùtù n'ala ruru madu n'ife-nzà nime nkpọkọta ndi Jehova.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Maika 2