Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 9:15-24 Bible Nso (IGBOB)

15. Ọ we weta nso onyinye iji biaru nso nke ndi Israel, were nkpi nke àjà-nmehie nke diri ndi ahu, b͕ue ya, chua ya n'àjà bayere nmehie, dika nke-mbu.

16. Ọ weta kwa àjà-nsure-ọku nso, me ya dika ikpé bayere ya si di.

17. Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.

18. O b͕u-kwa-ra ehi ahu na ebulu ahu, bú ihe àjà nke àjà-udo, nke diri ndi Israel: umu-ndikom Eron we me ka ọbara-ya rue ya aka, ọ we wusa ya n'ebe-ichu-àjà buruburu,

19. ha me-kwa-ra ka abuba nile nke putara n'ehi ahu rue ya aka; na ihe putara n'ebulu ahu, bú akuku ọdudu nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime, na akọrọ abua, na mba-imeju nke imeju:

20. ha we tukwasi abuba ahu n'okpukpu-obi, ọ we sure abuba ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'ebe-ichu-àjà:

21. ma okpukpu-obi-ha na utaku-ukwu aka-nri ka Eron fere ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova; dika Moses nyere iwu.

22. Eron we chilie aka-ya n'ebe ndi Israel nọ, gọzie ha; o si n'ime àjà-nmehie na àjà-nsure-ọku na àjà-udo rida.

23. Moses na Eron we ba n'ulo-ikwū nzute, puta kwa, gọzie ndi Israel: ewe me ka ndi ahu nile hu ebube Jehova anya.

24. Ọku we si n'iru Jehova puta, ripia àjà-nsure-ọku na abuba nile n'elu ebe-ichu-àjà: ndi Israel nile we hu ya, tie nkpu, da kpue iru-ha n'ala.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 9