Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 8:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Moses we si nzukọ ahu, Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu ka eme ya.

6. Moses we me ka Eron na umu-ya ndikom biaru nso, o were kwa miri sa ha aru.

7. O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.

8. Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.

9. Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.

10. Moses we were manu otite-manu ahu, te ebe-obibi ahu na ihe nile nke di nime ya, do ha nsọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 8