Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 4:22-31 Bible Nso (IGBOB)

22. Mb͕e onye-isi nēmehie, me kwa ihe n'amaghi-ama megide otù nime ihe nile Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

23. ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo nime ya, ọ gēweta nkpi, bú oké zuru okè, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso;

24. o gēbikwasi aka-ya n'isi nkpi ahu, b͕u kwa ya n'ebe anēb͕u anu àjà-nsure-ọku n'iru Jehova: àjà-nmehie ka ọ bu.

25. Onye-nchu-aja gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke àjà-nmehie na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, ọbara-ya ka ọ gāwusi kwa na ntọ-ala ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku.

26. Abuba-ya nile ka o gēsure ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-aja, dika abuba ihe àjà nke àjà-udo: onye-nchu-aja gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

27. Ma ọ buru na otù madu n'etiti ndi ala emehie n'amaghi-ama, n'ime ihe megide otù nime ihe Jehova nyere n'iwu bayere ihe anāgaghi-eme, ikpe ewe ma ya;

28. ọ buru kwa na eme ka ọ mara nmehie-ya nke ọ mehieworo, ọ gēweta kwa ewu, bú nne zuru okè, bayere nmehie-ya nke ọ mehieworo, ka ọ buru onyinye-ya iji biaru nso.

29. Ọ gēbi-kwasi aka-ya n'isi ihe àjà-nmehie ahu, b͕u kwa ihe àjà-nmehie ahu n'ebe àjà-nsure-ọku.

30. Onye-nchu-àjà gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, tiye ya n'elu mpi nile nke ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, ọ bu kwa ọbara-ya nile ka ọ gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.

31. Abuba-ya nile ka ọ gēwezuga, dika ewezugara abuba n'elu ihe àjà nke àjà-udo; onye-nchu-àjà gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe-ichu-àjà, ka ọ buru ihe ísì utọ anēsurere Jehova; onye-nchu-àjà gēkpuchi-kwa-ra ya nmehie-ya, agāb͕aghara kwa ya ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 4