Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 27:3-14 Bible Nso (IGBOB)

3. Ọgugu ọnu gi gābu kwa nke nwoke site n'onye b͕ara orú arọ we rue onye b͕ara ọgu aro atọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa ọgu shekel ọla ọcha abua na iri, dika shekel nke ebe nsọm si di.

4. Ma ọ buru na nwayi ka ọ bu, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa orú shekel na iri.

5. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara arọ ise we rue onye b͕ara orú arọ, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa orú shekel, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

6. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye ruru otù ọnwa we rue onye b͕ara arọ ise, ọ̀rùrù-ọnu-gi nke nwoke gābu kwa shekel ọla-ọcha ise, ma shekel ọla-ọcha atọ ka ọ̀rùrù-ọnu-gi gāburu nwayi.

7. Ma ọ buru na ọ bu site n'onye b͕ara ọgu arọ atọ we gaba n'iru; ọ buru na ọ bu nwoke, ọ̀rùrù-ọnu-gi gābu kwa shekel iri na ise, ma ọ gāburu nwayi shekel iri.

8. Ma ọ buru na onye dara ob͕eye ka ọ bu kari ọ̀rùrù-ọnu-gi, agēguzo kwa ya n'iru onye-nchu-àjà, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu; dika aka onye ahu nke nēkwe nkwa ruru ka onye-nchu-àjà gārù ya ọnu.

9. Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo, nke madu nēsite na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ihe ọ bula madu gēsite na ya nye Jehova gādi nsọ.

10. Ọ gaghāb͕anwe ya, ọ gaghi-enwo kwa ya, ezi ihe n'ọnọdu ihe ọjọ, ma-ọbu ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe: ma ọ buru na o were anu-ulo nwo anu-ulo ma-ọli nke ahu di kwa nsọ, ihe eji nwo ya gādi kwa nsọ.

11. Ma ọ buru na ọ bu anu-ulo ọ bula ruru árú, nke ha nēsiteghi na ya weta nso Jehova onyinye iji biaru nso, ọ gēme kwa ka anu-ulo ahu guzo n'iru onye-nchu-àjà:

12. onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ: dika ọ̀rùrù-ọnu-gi si di, gi onye-nchu-àjà, otú a ka ọ gādi.

13. Ma ọ buru na ọ gāb͕aputa ya n'ezie, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzọ ise ya n'ọ̀rùrù-ọnu-gi.

14. Ọzọ, mb͕e onye ọ bula gēdo ulo-ya nsọ idiri Jehova nsọ, onye-nchu-àjà gārù kwa ya ọnu, ma ọ bu ezi ulo ma-ọbu ulo ọjọ: dika onye-nchu-àjà gārù ya ọnu, otú a ka o gēguzo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 27