Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 26:13-19 Bible Nso (IGBOB)

13. Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu, Nke mere ka unu si n'ala Ijipt, si kwa n'iburu ha ndi-orù, puta; M'tijiwo kwa nkpọrọ nile nke yoke-unu, me kwa ka unu je ije iguzo-ọtọ.

14. Ma ọ buru na unu egeghm nti, unu ewe ghara ime ihe nile ndia M'nyere n'iwu;

15. ọ buru kwa na unu aju ukpurum nile, ọ buru kwa na nkpuru-obi-unu asọ ikpém nile oyi, unu ewe ghara ime ihe nile M'nyere n'iwu, ka unu we mebie ọb͕ub͕a-ndum;

16. Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.

17. M'gēche irum imegide unu, agētib͕u kwa unu n'iru ndi-iro-unu: ndi nākpọ unu asì gāzọda unu; unu gāb͕alaga kwa mb͕e ọ nādighi onye nāchu unu.

18. Ma ọ buru na unu agaghi-egem nti rue ihe ndia, M'gādọ kwa unu aka na nti ub͕ò asa ọzọ n'ihi nmehie nile unu.

19. M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 26