Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 22:7-12 Bible Nso (IGBOB)

7. Ma mb͕e anyanwu daworo, ọ gādi ọcha; emesia ọ gēri ihe ufọdu nime ihe nsọ nile, n'ihi na nri-ya ka ọ bu.

8. Ihe nwuru onwe-ya, ma-ọbu ihe anu-ọhia dọb͕uru, ọ gaghi-eri ya, iwere ya meru onwe-ya: Mu onwem bu Jehova.

9. Ha gēdebe kwa ihe-ndebem, ka ha we ghara ibū nmehie bayere ya, nwua nime ya, mb͕e ha nēme ya ka ọ ghara idi nsọ: Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

10. Ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe nsọ ahu: onye nānọdu n'ulo onye-nchu-àjà, ma-ọbu onye egoro ọlu agaghi-eri ihe nsọ ahu.

11. Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n'ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya.

12. Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 22