Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 22:11-14 Bible Nso (IGBOB)

11. Ma mb͕e onye-nchu-àjà gāb͕ata madu, bú onye o ji ego-ya b͕ata, onye ahu gēri ufọdu nime ya; ya na onye amuru n'ulo-ya, ndi ahu gēri ufọdu nime nri-ya.

12. Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e onye ala ọzọ nwere ya na nwunye, nwayi ahu agaghi-eri ihe ọ bula nime àjà-nbuli nke ihe nsọ nile.

13. Ma nwa-nwanyi onye-nchu-àjà, mb͕e ọ bu nwanyi di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi achupuru achupu, ma o nweghi nkpuru, o we laghachi n'ulo nna-ya, dika mb͕e ọ di na nwata, ihe nime nri nna-ya ka o gēri: ma ọ dighi onye ala ọzọ ọ bula gēri ihe ọ bula nime ya.

14. Ma mb͕e onye ọ bula gēri ihe nsọ n'amaghi-ama, ọ gātukwasi kwa otù uzọ n'uzo ise ya n'elu ya, nye onye-nchu-àjà ihe nsọ ahu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 22