Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 21:8-24 Bible Nso (IGBOB)

8. I gēdo kwa ya nsọ; n'ihi na nri Chineke-gi ka ya onwe-ya nēweta nso: nsọ ka ọ gādi n'ebe i nọ: n'ihi na nsọ ka Mu onwem, bú Jehova, di, Nke nēdo gi nsọ.

9. Nwa-nwayi nke onye-nchu-aja ọ bula kwa, mb͕e ọ gēme onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ site n'ikwa iko, nna-ya ka nwanyi ahu nēme ka ọ ghara idi nsọ: n'ọku ka agēsure ya.

10. Ma onye-nchu-àjà n'etiti umu-nna-ya, onye awukwasiworo manu nke otite-manu n'isi-ya, onye emejuwo-kwa-ra aka-ya iyiri uwe ahu, ọ gaghi-atọpu agiri-isi-ya, ọ gaghi-adọwa kwa uwe-ya;

11. ọ gaghi-abakuru kwa madu nwuru anwu, ọ gaghi-emeru kwa onwe-ya n'ihi nna-ya, ma-ọbu n'ihi nne-ya;

12. ọ gaghi-esi kwa n'ebe nsọm pua, ọ gaghi-eme kwa ka ebe nsọ Chineke-ya ghara idi nsọ; n'ihi na nkewapu nke manu nke otite-manu nke Chineke-ya dikwasi ya: Mu onwem bu Jehova.

13. Ya onwe-ya gāluru nwunye mb͕e ọ di na nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke.

14. Nwayi-di-ya nwuru, ma-ọbu nke achupuru achupu, ma-ọbu nke emere ka ọ ghara idi nsọ, bú nwayi nākwa iko, ndia ka ọ nāgaghi-aluru na nwunye: ma nwa-ab͕oghọ nāmaghi nwoke nke sitere n'umu-nna-ya ka ọ gāluru na nwunye.

15. Ọ gaghi-eme kwa ka nkpuru-ya ghara idi nsọ n'etiti umu-nna-ya: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ya nsọ.

16. Jehova we gwa Moses okwu, si,

17. Gwa Eron okwu, si, Nwoke ọ bula nke nkpuru-gi rue ọb͕ọ-ha nile nke ọlu di n'aru ya, ya abiarula nso iweta nri Chineke-ya nso.

18. N'ihi na nwoke ọ bula nke ọlu di n'aru ya, ọ gaghi-abiaru nso: nwoke nke bu onye-ìsì, ma-ọbu onye-ngwurọ, ma-ọbu nke nwere imi-npia, ma-ọbu nke nwere n'aru-ya ihe ibe-ya nēnweghi,

19. ma-ọbu nwoke nke ukwu kpajiri, akpaji, ma-ọbu aka kpajiri akpaji, di n'aru ya,

20. ma-ọbu onye-nkpunkpu-azu, ma-ọbu onye-ùkpọ̀, ma-ọbu nke nwere ntupọ n'anya-ya, ma-ọbu nke àb͕à nāta, ma-ọbu nke nwere ire-ebube, ma-ọbu nke nkpuru-amu-ya chipiara echipia;

21. ọ dighi nwoke ọ bula nke nkpuru Eron onye-nchu-àjà, nke ọlu di n'aru ya, gābiaru nso iweta àjà-ọku Jehova nso: ọlu di n'aru ya; ọ gaghi-abiaru nso iweta nri Chineke-ya nso.

22. Nri Chineke-ya, nke sitere n'ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile, na n'ihe nsọ nile, ka o gēri.

23. Nání na ọ gaghabà rue ákwà-nb͕ochim, ọ gaghi-abiaru kwa nso ebe-ichu-àjàm, n'ihi na ọlu di n'aru ya; ka ọ we ghara ime ka ebe nsọm nile ghara idi nsọ: n'ihi na Mu onwem bu Jehova nēdo ha nsọ.

24. Moses we gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 21