Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 18:1-14 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa umu Israel okwu, si ha, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

3. Unu emela dika omume ala Ijipt, nke unu biri nime ya: unu eme-kwa-la dika omume ala Kenean, nke Mu onwem nēme ka unu ba n'ebe ahu: unu ejeghari-kwa-la n'ukpuru nile ha.

4. Ikpém nile ka unu gēme, ọ bu kwa ukpurum nile ka unu gēdebe, ijeghari nime ha: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.

5. Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.

6. Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.

7. Ekpughela ọtọ nna-gi, bú ọtọ nne-gi: nne-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.

8. Ekpughela ọtọ nwunye nna-gi: ọtọ nna-gi ka ọ bu.

9. Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.

10. Ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwoke, ma-ọbu ọtọ nwa-nwayi nke nwa-gi nwayi, ekpughela ọtọ-ha: n'ihi na ọtọ-gi ka ọtọ-ha bu.

11. Ọtọ nwa-nwayi nke nwunye nna-gi, nke nna-gi muru, nwa-nne-gi nwayi ka ọ bu, ekpughela ọtọ-ya.

12. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nna-gi: onye-aru nna-gi ka ọ bu.

13. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwan yi nke nne-gi: n'ihi na onye-aru nne-gi ka ọ bu.

14. Ekpughela ọtọ nwa-nne-nwoke nke nna-gi, abiarula nwunye-ya nso: nwunye nwa-nne nna-gi ka ọ bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 18