Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 17:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova we gwa Moses okwu, si,

2. Gwa Eron, gwa kwa umu-ya ndikom, gwa kwa umu Israel nile, okwu, si ha; Nka bu ihe nke Jehova nyeworo n'iwu, si,

3. Nwoke ọ bula nke ulo Israel, nke nēb͕u ehi, ma-ọbu nwa-aturu, ma-ọbu ewu, n'omuma-ulo-ikwū, ma ọbu nke nēb͕u ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū,

4. ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, iweta ya nso ka ọ buru onyinye iji biaru nso Jehova n'iru ebe-obibi Jehova: ọbara ka agāguru nwoke ahu; ọbara ka ọ wusiworo; agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti ndi-ya:

5. ka umu Israel we weta àjà nile ha, nke ha onwe-ha nāchu n'ọhia sara iru, ọbuná ka ha we wetara ha Jehova, rue ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, were ha biakute onye-nchu-àjà, chua ha ka ha buru ihe àjà nke àjà udo anāchuru Jehova.

6. Onye-nchu-àjà gāwusa ọbara-ha n'elu ebe-ichu-àjà nke Jehova n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, sure kwa abuba-ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ka ọ buru ihe ísì utọ anāchuru Jehova.

7. Ha agaghi-achu-kwa-ra nkpi àjà-ha ọzọ, nke ha onwe-ha so nākwa iko. Ukpuru ebighi-ebi ka nka gāburu ha rue ọb͕ọ-ha nile.

8. I gāsi kwa ha, Nwoke ọ bula nke sitere n'ulo Israel, ma-ọbu na ndi-ọbìa ndi nọ dika ọbìa n'etiti ha, nke nēsure àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà ọzọ,

9. ma ọ wetaghi ya n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute imere ya Jehova, agēbipu kwa nwoke ahu n'etiti umu-nna-ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 17