Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:44-58 Bible Nso (IGBOB)

44. onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.

45. Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.

46. Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.

47. Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;

48. ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:

49. ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:

50. onye-nchu-àjà gāhu ihe-otiti ahu, mechibido kwa ihe nwere ihe-otiti nime ulo ubọchi asa:

51. ọ gāhu kwa ihe-otiti ahu n'ubọchi nke-asa: mb͕e ihe-otiti ahu baworo aba n'uwe, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'akpukpọ, nke ihe ọ bula agēji akpukpọ me iji je ozi; ekpenta nke jọb͕uru onwe-ya ka ihe-otiti ahu bu; ihe ruru árú ka ọ bu.

52. O gēsure kwa uwe ahu ọku, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, n'aji-anu ma-ọbu na flax, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke ihe-otiti ahu di nime ya: n'ihi na ekpenta jọb͕uru onwe-ya ka ọ bu; n'ọku ka agēsure ya.

53. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu abaghi aba n'uwe ahu, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula;

54. onye-nchu-àjà gēnye kwa iwu ka ha sua ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya, o gēmechibido kwa ya nime ulo ubọchi asa ọzọ:

55. onye-nchu-àjà gāhu kwa, mb͕e asuchasiri ihe-otiti ahu: ma, le, ọ buru na ihe-otiti ahu ab͕anweghi iru-ya, ọ buru kwa na ihe-otiti ahu abaghi aba, ihe ruru árú ka ọ bu; n'ọku ka i gēsure ya: ekpenta ka ọ bu, ma ọ bu n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha.

56. Ma ọ buru na onye-nchu-àjà ahú, ma, le, ihe-otiti ahu bu ihe anāhu inyoghi-inyoghi mb͕e asuchasiri ya, ọ gādọwapu kwa ya nime uwe ahu, ma-ọbu nime akpukpọ ahu, ma-ọbu nime nke akpara ogologo, ma-ọbu nime nke akpara uhie.

57. Ma ọ buru na anāhu ya n'uwe ub͕u a, ma ọ bu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu na nke ihe akpukpọ ọ bula, ihe nāb͕awaputa ka ọ bu: n'ọku ka i gēsure ihe ahu nke ihe-otiti ahu di nime ya.

58. Uwe ahu kwa, ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie, ma-ọbu ihe akpukpọ ọ bula, nke i gāsu, ọ buru na ihe-otiti ahu esiwo nime ha wezuga onwe-ya, agāsu kwa ya nke ub͕ò abua, ọ gādi kwa ọcha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13