Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Levitikọs 13:40-49 Bible Nso (IGBOB)

40. Ma onye ọ bula, mb͕e agiri-isi kwọchapuworo n'isi-ya, onye-isi-nkwọcha ka ọ bu; ọcha ka ọ di.

41. Ọ buru kwa na agiri-isi-ya akwọchapuwo n'isi-ya na nko iru-ya, onye egedege-iru-ya kwọchara akwọcha ka ọ bu: ọcha ka ọ di.

42. Ma mb͕e ihe-otiti nke di ọcha nācha ọbara di n'isi-nkwọcha ahu ma-ọbu n'egedege-iru ahu kwọchara akwọcha; ekpenta nke nāb͕awaputa n'isi-nkwọcha-ya, ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, ka ọ bu.

43. Onye-nchu-àjà gāhu kwa ya: ma, le, ọ buru na ihe-otutó nke ihe-otiti ahu di ọcha nācha ọbara-ọbara n'isi-nkwọcha-ya ma-ọbu n'egedege-iru-ya kwọchara akwọcha, dika ekpenta nke akpukpọ anu-aru si di, n'ile ya anya;

44. onye-ekpenta ka ọ bu, ihe ruru árú ka ọ bu: onye-nchu-àjà aghaghi isi na ọ ruru árú; n'isi-ya ka ihe-otiti-ya di.

45. Ma onye-ekpenta, nke ihe-otiti ahu di n'aru ya, uwe-ya nile gābu ihe dọwara adọwa, agiri-isi-ya ganātọpu kwa atọpu, o gēkpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ya nke-elu, nākpọ, si, Onye ruru árú, onye ruru árú.

46. Ubọchi nile nke ihe-otiti ahu di n'aru ya ka ọ gāru árú; onye ruru árú ka ọ bu: ọ gēbi iche; n'azu ọmuma-ulo-ikwū ka ebe-obibi-ya gābu.

47. Uwe kwa, mb͕e ihe-otiti ekpenta di nime ya, ma ọ bu uwe aji-anu, ma-ọbu uwe flax;

48. ma ọ bu nke akpara ogologo, ma-ọbu nke akpara uhie; nke flax, ma-ọbu nke aji-anu; ma ọ bu n'akpukpọ, ma-ọbu n'ihe ije-ozi ọ bula eji akpukpọ me:

49. ọ buru kwa na ihe-otiti ahu acha akwukwọ ndu akwukwọ ndu ma-ọbu ọbara-ọbara n'uwe, ma-ọbu n'akpukpọ, ma-ọbu na nke akpara ogologo, ma-ọbu na nke akpara uhie, ma-ọbu n'ihe akpukpọ ọ bula; ihe-otiti ekpenta ka ọ bu, agēme kwa ka onye-nchu-àjà hu ya:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Levitikọs 13