Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 9:12-27 Bible Nso (IGBOB)

12. Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:

13. karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.

14. Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.

15. Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.

16. O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n'etiti ha ka ndi ahu nēbi.

17. Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.

18. Ma umu Israel etib͕ughi ha, n'ihí na ndi-isi nzukọ Israel ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi. Nzukọ ahu nile we tamu ntamu megide ndi-isi.

19. Ndi-isi nile we si nzukọ ahu nile, Ayi onwe-ayi ewerewo Jehova, bú Chineke Israel, ṅuara ha iyi: ma ub͕u a ayi apughi imetu ha aka.

20. Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.

21. Ndi-isi we si ha, Ka ha di ndu: ha we ghọrọ nzukọ Israel nile ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri; dika ndi-isi gwara ha okwu.

22. Joshua we kpọ ha, gwa ha okwu, si, N'ìhi gini ka unu ghọb͕uru-ayi, si, Ndi bi n'ebe dipuru unu anya nke-uku ka ayi bu; ma unu onwe-unu nēbi n'etiti ayi?

23. Ma ub͕u a, ndi anābu ọnu ka unu bu, agaghi-ebipu kwa n'etiti unu ndi gābu orù, ma ndi-ọwa-nkú ma ndi-ose-miri bayere ulo Chinekem.

24. Ha we za Joshua, si, N'ihi na egosiri ndi-orù-gi n'ezie na Jehova, bú Chineke-gi, nyere Moses, bú orù-Ya, iwu inye unu ala nka nile, na ikpochapu ndi nile bi n'ala nka n'iru unu; ayi we tua egwu nke-uku bayere ndu-ayi n'ihi unu, ayi we me ihe a.

25. Ma ub͕u a, le, ayi nọ n'aka-gi: dika o si di nma, dika o si zi kwa ezi n'anya-gi ime ayi, me.

26. O we me ha otú a, naputa ha n'aka umu Israel, ha eb͕ughi kwa ha.

27. Joshua we me ha n'ubọchi ahu ndi-ọwa-nkú na ndi-ose-miri bayere nzukọ Israel, baye-kwa-ra ebe-ichu-àjà Jehova, rue ta, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 9