Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 9:1-17 Bible Nso (IGBOB)

1. O rue, mb͕e eze nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya;

2. na ha chikọtara onwe-ha, ibuso Joshua na ibuso Israel agha, n'otù ọnu.

3. Ma ndi bi na Gibeon nuru ihe nke Joshua mereri Jeriko me kwa Ai,

4. ha we were aghughọ me ihe, ọbuná ndi ahu, ha we je, me dika ndi ezìri ozi, ha we chiri akpa kara nká n'elu inyinya-ibu-ha, na karama-akpukpọ manya-vine, nke kara nká, dọwa kwa adọwa, ekezi-kwa-ra ekezi;

5. akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.

6. Ha we jekuru Joshua rue ọmuma-ulo-ikwū na Gilgal, si ya, si kwa ndikom Israel, Ala di anya ka ayi si bia: ma ub͕u a ka ayi na unu b͕a ndu.

7. Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n'etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu?

8. Ha we si Joshua, Ndi-orù-gi ka ayi bu. Joshua we si ha, Òle ndi ka unu bu? òle ebe unu si bia kwa?

9. Ha we si ya, Ala di anya nke-uku ka ndi-orù-gi si bia n'ihi aha Jehova, bú Chineke-gi: n'ihi na ayi anuwo akukọ- Ya, na ihe nile O mere n'Ijipt,

10. na ihe nile O mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi biri n'ofè Jọdan, bú nke O mere Saihon, bú eze Heshbon, me kwa Og, bú eze Beshan, nke nọ n'Ashtarot.

11. Ndi-okenye-ayi na ndi nile bi n'ala-ayi we gwa ayi okwu, si, Werenu ihe unu gēri n'uzọ n'aka-unu, je izute ha, si ha, Ndi-orù-unu ka ayi bu: ma ub͕u a, ka ayi na unu b͕a ndu.

12. Achicha-ayi a, mb͕e ọ di ọku ka ayi weputara ya n'ulo-ayi ibu ihe ayi gēri n'uzọ n'ubọchi ayi putara ijekuru unu; ma ub͕u a, le, ọ kpọwo nku, ma kwa ebu:

13. karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.

14. Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.

15. Joshua we me ka udo di n'etiti ha na Israel, ya na ha we b͕a ndu, ka ọ kwe ka ha di ndu: ndi-isi nzukọ Israel we ṅuara ha iyi.

16. O rue, n'ọgwugwu ubọchi atọ mb͕e ha na ha b͕asiri ndu, na ha nuru na ndi-ab͕ata-obi-ha ka ha bu, na ọ bu kwa n'etiti ha ka ndi ahu nēbi.

17. Umu Israel we bilie ije, biarue obodo nile ha n'ubọchi nke-atọ. Ma obodo-ha bu Gibeon, na Kefira, na Beirot, na Kiriat-jearim.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 9