Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 8:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n'akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n'etiti ndagwurugwu ahu n'abali ahu.

14. O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.

15. O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara.

16. Ewe tikue ndi nile nọ n'obodo ahu nkpu ichu ha n'azu: ha we chua Joshua n'azu, ewe dọpu ha n'obodo.

17. Ọ dighi kwa nwoke fọduru na Ai ma-ọbu na Bet-el, nke nāpughi ichu Israel: ha we rapu obodo ahu ka o ghere oghe, we chua Israel n'azu.

18. Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di.

19. Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.

20. Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 8