Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 7:1-12 Bible Nso (IGBOB)

1. Ma umu Israel mekpuru ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova; n'ihi na Ekan nwa Kami, nwa Zabdi, nwa Zera, nke ebo Juda, were ufọdu nime ihe ahu ewezugara nye Jehova; iwe Jehova we di ọku megide umu Israel.

2. Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.

3. Ha we laghachikuru Joshua, si ya, Ka ndi Israel nile ghara irigo; ka ihe ra ka nnù ndikom ise, ma-ọbu ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri, rigo, tib͕ue Ai; emela ka ndi Israel nile dọb͕ue onwe-ha n'ọlu iru ebe ahu; n'ihi na madu ole-na-ole ka ha di.

4. Ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we rigo n'ebe ahu site na ndi Israel: ha we b͕alaga n'iru ndikom Ai.

5. Ndikom Ai we tib͕ue ihe ra ka orú madu na iri na isi sitere na ha: ha we si n'iru ọnu-uzọ-ama chugide ha rue Shebarim, we tib͕ue ha na nrida ahu: obi we lọ ndi Israel miri, we ghọ miri miri.

6. Joshua we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, da kpue iru-ya n'ala n'iru ib͕e Jehova rue anyasi, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel; ha we kpokwasi ájá n'isi-ha.

7. Joshua we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova, n'ìhi gini ka I meworo ka ndi nka gabiga Jọdan ma-ọli, inye ayi n'aka ndi-Amorait, ime ka ayi la n'iyì? ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi kwere we biri n'ofè Jọdan!

8. Biko, Onye-nwe-ayi, gini ka m'gēkwu, mb͕e Israel b͕akutasiri azu-ha n'iru ndi-iro-ha?

9. Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi?

10. Jehova we si Joshua, Gi bilie; n'ìhi gini bu nka na i nāda kpu iru-gi n'ala?

11. Israel emehiewo; ọzọ kwa, ha agabigawo ọb͕ub͕a-ndum nke M'nyere ha n'iwu: ọzọ kwa, ha ewerewo ufọdu nime ihe ewezugara nyem; ọzọ kwa, ha ezuwo ori, ọzọ kwa, ha aghọwo aghughọ, ọzọ kwa, ha etiyewo ya n'ihe-ha.

12. Umu Israel apughi kwa iguzosi ike n'iru ndi-iro-ha, ha nāb͕akuta azu n'iru ndi-iro-ha, n'ihi na ha aghọwo ihe ewezugara ka ebibie ha: M'gaghi-anọyere unu ọzọ, ma ọ buru na unu ekpochapughi ihe ahu ewezugara nyem n'etiti unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 7